Psalms 105

Toonu Chineke onye na-edebe ọgbụgba ndụ

1Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya.
Meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ.
2Bụkuo ya abụ, bụkuo ya abụ otuto;
kwupụtanụ ọrụ ihe ịrịbama ya niile.
3Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya;
ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa.
4Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya,
chọọnụ ihu ya mgbe niile.

5Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ,
ihe ịrịbama ya niile na ikpe ziri ezi niile si nʼọnụ ya pụta,
6unu ụmụ ụmụ Ebraham, bụ ohu ya,
unu ụmụ ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara.
7Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị;
ikpe ya dị nʼụwa niile.

8Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi,
bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ,
9ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara
na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik.
10O mere ka o guzoro nye Jekọb dịka ụkpụrụ,
ma nʼebe Izrel nọ, dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi:
11“Aga m enye gị ala Kenan
dịka oke i ga-eketa.”

12Mgbe ha dị ole na ole nʼọnụọgụgụ,
nʼezie ha dị ole na ole, bụrụkwa ọbịa nʼime ya.
13Ha wagharịrị site nʼotu mba gaa na mba ọzọ,
sitekwa nʼotu alaeze gaa alaeze ọzọ.
14O kweghị ka onye ọbụla mekpaa ha ahụ;
ọ baara ndị eze mba nʼihi ha;
15sị, “Unu emetụkwala ndị m e tere mmanụ aka;
unu emekpakwala ndị amụma m ahụ.”

16O zitere ụnwụ nʼala ahụ,
bibie ụzọ niile ha si enweta ihe oriri;
17o zipụrụ otu nwoke ka ọ gaa nʼihu ha,
Josef, onye e refuru dịka ohu.
18Ha ji mkpọrọ igwe merụọ ya ahụ nʼụkwụ,
nyanyekwa ya mkpọrọ igwe nʼolu,
19tutu ruo mgbe ihe ahụ o kwuru na ọ ga-eme mezuru,
tutu ruo mgbe okwu Onyenwe anyị nwapụtara ya dịka onye eziokwu.
20Eze ahụ zipụrụ ozi ka a tọpụ ya,
onye ahụ na-achị ndị dị iche iche mere ka o nwere onwe ya.
21O mere ya ka ọ bụrụ onyenwe ezinaụlọ ya,
onye na-achị ihe niile o nwere,
22ikuziri ụmụ eze ndị ikom dịka o si masị ya,
na izi ndị okenye ya amamihe.

23Mgbe ahụ, Izrel bara nʼala Ijipt;
Jekọb bikwara nʼala Ham dịka onye si mba ọzọ bịa.
24 Onyenwe anyị mere ka ndị ya mụbaa nke ukwuu;
o mere ka ndị ya dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa ndị iro ha,
25ndị ọ tụgharịrị obi ha ka ha kpọọ ndị ya asị,
ka ha gbaa izu nzuzo megide ndị ohu ya.
26O zipụrụ Mosis, ohu ya,
na Erọn, onye ọ họpụtara.
27Ha mere ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche nʼetiti ha,
ọrụ ebube ya dị iche iche nʼala Ham.
28O zipụrụ ọchịchịrị, mee ka ala ahụ gbaa ọchịchịrị,
nʼihi na ha nupuru isi megide okwu ya.
29O mere ka mmiri ha niile ghọọ ọbara,
nke mere ka azụ niile dị nʼime ya nwụsịa.
30Ala ha niile jupụtara nʼawọ
ọ bụladị nʼime ọnụụlọ ndina nke ndị na-achị achị.
31O kwuru okwu, igwe ijiji na anwụ nta
dị iche iche ejupụta nʼala ha niile.
32Nʼọnọdụ mmiri ozuzo, o zitere ha
mkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe nʼala ha niile;
33o tijisịrị osisi vaịnị na osisi fiig niile ha,
kwatusịakwa osisi niile dị nʼala ha.
34O kwuru okwu, igurube na ụkpana
a na-apụghị ịgụta ọnụ jupụtara ebe niile;
35ha richapụrụ ihe niile bụ ahịhịa ndụ dị nʼala ahụ,
ripịakwa mkpụrụ niile ha kụrụ nʼubi ha.
36Mgbe ahụ, o gburu ndị niile e buru ụzọ mụọ nʼala ahụ,
mkpụrụ mbụ nke ndị ikom ha.
37Ọ kpọpụtara ụmụ Izrel, ndị chịịrị ọlaọcha na ọlaedo,
ọ dịghị otu onye nʼime ebo ya niile nke ahụ na-esighị ike.
38Obi dị Ijipt ụtọ mgbe ha pụrụ,
nʼihi na oke egwu ndị Izrel dakwasịrị ha.

39Ọ gbasara igwe ojii dịka ihe mkpuchi,
na ọkụ na-enye ìhè nʼabalị.
40Ha rịọrọ ya, o zitere ha ụmụ nnụnụ kweel,
jirikwa achịcha si nʼeluigwe nyejuo ha afọ.
41O tiwara nkume ahụ, mmiri sọpụtara;
ọ sọgharịrị nʼime ọzara dịka iyi.

42Nʼihi na o chetara nkwa ya dị nsọ,
nke o kwere ohu ya Ebraham.
43O ji aṅụrị dupụta ndị ya,
jirikwa ọnọdụ iti mkpu ọṅụ dupụta ndị ya ọ họpụtara;
44o nyere ha ala niile nke mba dị iche iche,
ha ghọrọ ndị nnweta nke ihe ndị ọzọ rụpụta,
45ka ha nwee ike debe ụkpụrụ ya niile
ma na-erubekwa isi nʼiwu ya niile.

Toonu Onyenwe anyị.
Copyright information for IboBIU